2 Samuel 22

Abụ otuto Devid

1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. 2Ọ sịrị:

Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m.
Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m,
site nʼaka ndị na-eme ihe ike.

4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
Mmekpa ahụ nke na-eweta mbibi bịakwasịrị m

6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
akpọkuru m Chineke m.
Akwa m ruru ya ntị.
O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
ntọala eluigwe makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.
Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
10O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
14 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
15Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
16E kpughere ala ala nke oke osimiri.
Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,
site nʼịba mba nke Onyenwe anyị,
na nkuume si nʼimi ya pụta.

17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

21Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
22Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;
ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
23Iwu ya niile dị nʼihu m,
esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
24Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
25 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.

26“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha.
Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
33Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
35Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
36Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
37Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.
Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

38“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.
Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
39Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
40Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
41I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
Ebibiekwala m ha niile.
42Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
43Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.

44“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.
Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba.
Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
45Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
46Obi na-ada ha mba.
Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

47Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
I mere ka m dị elu karịa ndị iro m.
Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
Aga m abụku aha gị abụ otuto.

51“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.
Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere.
Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
Copyright information for IboBIU